Kedu otu nna nwam nwere ike isi kwadom mgbe ndi ime na kwa mgbe m muru nwa

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_otu_nna_nwam_nwere_ike_isi_kwadom_mgbe_ndi_ime_na_kwa_mgbe_m_muru_nwa

Ima mgbe idi ime, na nna nwa gi na agbali inyere gi aka nakwa ihu na inwere ihe niile gi na nwa choro bu ihe magburu onwe ya na mma. O buru na o gaghi arunwu oru niile unu choro, o kwesiri ichota onye ga aru ya. O nwekwara ike ihu na iriri ezigbo nri niile i kwesiri iri ma ga nleta ahu afo ime. O kwesiri ka elekwa ya ahu maka HIV na STI. O buru na o bu HIV, okwesiri idi na eji okpu nna bu enyi na mmeko.

Nna nwa gi nwere ike inyere gi aka oge imu nwa site na:

  • Igba mbo hu na mmiri na nri zuru oke di n’ulo.
  • Idute onye okachamalu maka imu nwa n’ulo, gbaa mbo hu na edebere otu aga esi ga ulo ogwu ma enwe ihe gbata gbata
  • Ileta umu aka ndi ozo.

O buru na o noro n’ime ebe ana amu nwa, o kwesiri inye gi nkwado niile i choro. O nwere ike i na agwa gi, na i na eme ofuma, wetara gi mmiri onunu, hia gi aka n’azu, nyere gi aka otu obula ichoro ya.

Gwa nna nwa gi na izu uka isii ka amuchara nwa di oke mkpa iji hu na nwanyi gbakere nke oma. N’ime oge a, ahu gi choro naani ezigbo nri na enye ihe na ahu na kwa ezumike. O ga enyere gi aka izuike ma o bido ruwa oru di n’ulo dika ichu mmiri, ikpata nku, ileta umu unu ndi ozo nakwa isi nri. O buru na omenwughi ya, ya chota ndi ozo ga eme ya.

O buru na o soro na eleta nwa anya na egwusa ya egwu, ngi onwe gi ga enwe efe hie ura, zuo ezigbo ike.

O kwesiri ka agwa ya ka o hapu ikpatu gi aka tutu ikwusi igba obara. Nke a di mkpa, ga i ghara inwe infekshun akpa nwa.

Na ikpeazu, ichere opekatampe afo abuo tutu atuta ime ozo bu uzo e si ahu na nne na nwa nwere ezi ahu ike. Otu uzo nna nwa gi ga esi enyere ezi na ulo unu aka bu inabata nhazi ezi na ulo n’udi famili planin. Kpaa nkata gbasara ihe a ma kwetanu nke ka mma. Unu nabo kwesiri igba mbo hu na emere nkea nke oma.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010719