Kedu udi ihe m kwesiri ileputara anya

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_udi_ihe_m_kwesiri_ileputara_anya

Juo onwe gi ajuju ndia:

O na ekwo ekworo ma o hu gi na onye ozo, ma o bu si na i na asiri ya asi? Ihu na i na agbanwe omume gi iji hu na onweghi jelosi gbasara onye obula i mara na onye ahu na api gi ka remute.

O na cho ikwusi gi ihu ndi enyi ma o bu ezi na ulo gi? O na acho ikwusi gi ime ihe na onwe gi otu isi choo ya? Odighi mkpa ihe o jiri eme ihea. O ga akara ya mfe ime gi ihe ike ma o buru na inweghi onye enyemaka.

O na akwa gi emu ma o bu kparia gi n’ihu ndi mmadu? O gaghi ete aka ibido ikwenye na ihe ojoo o na ekwu maka gi, bido chewe na mmadu ekwesighi ileta gi anya nke oma.

Kedu ihe o na eme ma iwe webe ya, o na akwasasi ihe nille di na ulo? O na aku gi ihe? Ihunugo ya ebe o tiri nwanyi ihe? Ihe ndia ga egosi na onweghi ijide onwe ya aka.

O na enwe nsopuru nyere ndi ka ya na okwa? Dika nne na nna ya, ndi oru ya, ndi nkuzi ya? O nwere ike idi ya n’ulo ka o nweghi udi ikike ndi ahu nwere. Nke a ga eme ya o na acho irugide ndi ozo na ezi na ulo ya.

O nadi asi na ogwu ike, mmanya na nrugide bu ihe na eme ya otu ahu? O buru na o na ebo ya ihe ozo, o nwere ike isi na o nweta oru, ma o bu onweta ihe o na acho, ma o bu okwusi inu manya and ogwu ike, na o ga akwusi.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig020108