Kedu udi mwakpo n’ike dinu
Ha ka nku mana o bughi ha ncha ka a na ahu otu ahu. Na imatu, oge ufodu, ufodu ihe nwere ike iduga nwanyi inwe mmeko o na achoghi. Udi ihe a na eme n’ime anumu di na nwunye. Ebe emere umu nwanyi o di ha ka inwe mmeko bu oke na oru diiri ha, ma ha achoro ma ha achoghi. O bu ezie na obodo anaghi ata onye obula uta maka nke a, mana o di njo.
O nwere umu nwanyi o buuru otu ha si azo ndu ha, inweta nkwado maka umu ha, inwe ebe obibi, inweta ego, ma o bu ka aghara inara ya oru ya. Onweghi onye n’uwa kwesiri iji otu a nara nwanyi ihe n’ike o na achoghi ime.
Na mmekorita obula, nwanyi nwere ike ikwete ma o bu ju mmadu choro mmeko, O buru na oju, ihe nwoke ga eme bu ikweta ihe okwuru ma o bu ima ka o gbanwe obi ya ma o bu naa ya na ike. O burugodi na nwanyi ma nwoke ahu wee kweta n’ihi na ohughi uzo ozo o ga eji gbalaga n’ihi nwoke ahu ekweghi ya, o bu nwakpo.
O na ahia aru nwanyi igbaga ozo enyemaka ma o buru na nwoke ahu bu onye o ma. O na aka njo ma o buru na o bu nwoke o ga ahu ozo.
Oge obula awakporo nwanyi, ma eji ike ma o na ejighi, o na ebutere nwanyi ezigbo nsogbu na ndu na kwa odimma ya.