Kedu usoro eji eleta mgbada ahu ma o bu ebe a na-akpo Pelvis

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Kedu_usoro_eji_eleta_mgbada_ahu_ma_o_bu_ebe_a_na-akpo_Pelvis

Onye ahu ike ga ele anya na mputa ebe mmadu jiri buru nwanyi. Ihe o na acho bu ihu ma onwere ebe zara aza, ma o bu ebe ihe toro, ma o bu ebe onya di, ma o nwere ebe na cha ka ihe ozo.

Onye ahu ike ahu ga etinye igwe a na akpo Spekulom n’ime ahu ahu nwanyi. Spekulum bu obere igwe-ihe na eme ka ahu nwanyi ghere oye na enyere onye ahuike aka inyocha ime ebe ahu. Otu ahu ka o ga esi kwe ya ileta maka ihe ndia anyi kwugoro maka ya. Usoro a adighi afu ufu ma o ga adi onye ahu ka apidoro ya ihe apido ebe ahu. Usoro a ga aga nke oma ma obi onye ahu dajuo makwa o buru na mamiri adighi akpa ya.

O buru na ulo ahuike ahu nwere laboratri, onye ahuike ahu ga eme nleta maka nje a na ebute site na mmeko nwoke na nwanyi, ma o di mkpa. O nwekwara ike ime nleta ihu ma enwere mgbanwe obula na mmepe akpa nwa onye ahu nwere ike imesia buru Kansa. Nke a nwere ike ibu ihe oyibo kporo pap test, ma o bu o jiri anya legharia ebe ahu ma o bu o jiri uzo ohuru emepere iji mee nleta maka HPV, nje o bu ya na ebute Savikal Kansa. Nleta ndi a niile anaghi afu ufu ma e were Spekulom mee ya. O buru na ahu Kansa n’oge na nleta niile a, malite ogwugwo, enwere ike imeri ya nke oma.

Onye ahuike ahu wepu ya bu Spekulom, o yiri gulovu di ocha, wee tinye mkpisi aka abuo n’ime ahu nwanyi. O ga ewere aka ya nke ozo na ebi na mgbada afo onye ahu. Otua ka o ga esi hu ka akpa nwa ha, ebe o di na kwa ihe ndi ozo di ebe ahu. Okwesighi ifu ufu, ma o buru na o na afu ufu, onye ahu kwesiri ikwu n’ihi na onwere ike iputa na ihe adichaghi mma.

Maka ufodu nsogbu, onye ahu ike nwere ike ime nleta ike mmadu. Onye ahu ga alunye otu mkpisi aka ebe ahu na kwa otu aka ozo n’ahu nwanyi. Nke a kwesiri igosi ma e nwere nsogbu obula na ebe, ma na akuku ebe ahu.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010205