Maka gini ka m ji kwesi imetu aram aka iji choputa ma odikwa mma kwa mgbe kwa mgbe

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/Maka_gini_ka_m_ji_kwesi_imetu_aram_aka_iji_choputa_ma_odikwa_mma_kwa_mgbe_kwa_mgbe

Nwanyi kwesiri imetu ara ya aka n’onwa n’onwa, ma nso ya aka na abia, ma o kwusigo kpam kpam.

A nadi enwe obere mkpuru na di na ara otutu umu nwanyi. Ha nadi agbanwe na ibu n’oge nso umu nwanyi. Ha na-adi nro ma oruwe mgbe nwanyi ga agba obara. Mana mgbe ufodu, obughi mgbe niile, e nwere udi mkpuru a ga ahu, nke na ekweghi ana, nke nwere ike bu Kansa. Nwanyi nwere ike iji aka ya choputa mkpuru a ma omuta etu esi api ahu ya ebe ahu aka. O mee nkea kwa onwa, o ga amara ka ebe ahu na di, wee mara mgbe ihe adighi mma ebe ahu.

O buru na nwanyi nwee mmeru ahu ga eme na o gaghi emenwu ihea, o nwere ike igwa onye o tukwasara obi ka o mere ya ya.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig010212