O ga adi mma munwa iche maka ihazi ezi na ulo ma o bu Famili Planin na bekee

From Audiopedia - Accessible Learning for All
Jump to: navigation, search
QR for this page

https://www.audiopedia.org/O_ga_adi_mma_munwa_iche_maka_ihazi_ezi_na_ulo_ma_o_bu_Famili_Planin_na_bekee

Umu nwanyi nwere disability ka nku ndi ana agwaghi ihe o bula gbasara mmeko ma o bu nhazi ezi na ulo (famili planin) na agbanyeghi na ha nwere ike idi ime, ma ndi na di enweghizi ihe a na kpo ‘feelings’ na mgbada ahu ha. Nya bu oburu na i ga enwe mmeko ma ichoghi idi ime, i ga ahu na imere family planin.

Lee udi ihe ikweisiri icheta na ichowa nke iga eme:

O buru na inwere Stroke ma o bu na idighi aga ije, i mela nke eji hormone eme di ka birth control pil, agbala ogwu ma o bu tinye implant. Ha ga enye nsogbu akporo blood clot.

O buru na onweghi ihe o na adigi ka ya ma emetu gi aka na afo (inweghizi filin ebe ahu) , etinyela nke a na akpo intrauterine device nya bu IUD. Etinyeghi nke oma i nwere ike ibute oria a na ebute na mmeko, nya bu STI. O buru na ibute ya bu STI, i gaghi ama na inwere ya n’ihi na inweghizi filin ebe ahu.

O buru na inaghi ejizi aka gi eme ihe, o nwekwara ike isi ike ime nke a na akpo ‘barrier method’ dika nke a na etinye na dayafram, okpu nna bu enyi umu nwanyi ma o bu nke a na akpo fom. O buru na i ga ajunwu onye nke gi, gwa ya ka o tinyere gi ya.

Disabiliti gi gbanwee, o ga adi mkpa igbanwe nke i na eji ahazi ezi na ulo gi.

Okpu nna bu enyi adighi egbochi so afo ime, o na enyere aka ikpuchi HIV ma o STI.

Sources
  • Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.
  • Audiopedia ID: ig011111