Anaghim aru oru n’ulo anam aru na ofis - e nwerem ike inye nwa ara otu ahu
Otutu umu nwanyi anaghi aru oru n’ulo. Nkea a na eme ya osie obere ike inye nwa nri na abughi ara site na oge amuru ya ruo onwa isii. Ma nwa gi nwere ike iria oria ma o buru na onwetaghi nri a. Nwanyi na-aru oru ekwesighi iha otu n’ime ihe nabo a n’ihi na ha abuo di ezigbo mkpa nke ukwuu.
Nke a bu ihe kpatara umu nwanyi na aru oru ji kwesi inwe nghota na enyemaka onye obula. Ufodu ulo oru na ekwe ka umu nwanyi kpota nwa ha na ofis ka inye ha ara wee diri ha mfe. Nkea na enyere ezi aka. O buru na nwanyi nwere dakia (day care) nso, onwere ike idi na aga ebe ahu nye nwa nri n’ihi na otutu ulo oru na akwado nkea ka o wee diri umunwayi mfe iru oru ma nye nwa nri.
Lee ufodu uzo i ga esi hu na nwa gi nwetara nani mmiri ara ma o buru na i na aru oru:
OKWU DI OKE MKPA: mmiri ara agbaputara agbapu, ana edebenwughi ebe o ga aju oyi kwesiri ka etufuo ya. O buru na o na esi isi, tufuo ya ozugbo ozugbo. Enyekwala ya nwa mancha n’ihi na o ga emeru nwa ezigbo ahu.