Gini ka m kwesiri ima maka mgbanwe na ahu mmadu ma o bu oria o bu nrugide stress butere
Mmadu noro n’ime oke stress ma o bu nrugide, ahu ha ga akwado igbochi ya. Nkea na eme, udi ihea nwere ike ime:
O buru na nrugide siri ike, nwanyi nwere ike ihu ihe ngosi ndi a akporo aha na ahu ya. O gafee, ahu ya alaghachi azu. Mana oburu na nrugide a ji nwayo bia, onwe ike o gaghi ahu otu o si emetuta ya na agbayehi na ihe ngosi ndia di ya na ahu.
Nrugide na adighi agwu agwu nwere ike ibute ihe ngosi a na ahu na anzayiti na deprashon di ka isi owuwa, nsogbu mgbilima afo (intestinal problems) na ike ogwugwu. O no tee aka, nrugude ga ebute oria di ka obala mgbani elu nwere ike ibute stroke ma o bu hat atak.
Na otutu ebe, adighi akpachapuru nsogbu adighi ahu anya udi anya ekwesiri. N’ihi nkea ndi mmadu nwere ike ichoputa na ha nwere anzayiti na depreshon nani oge ha nwere nsogbu ana ahu anya. Di ka odi mkpa ikpachapuru nsogbu ana ahu anya anya, otu ahu ka o ji di mkpa ikpachapuru nke adighi ahu anya, anya.