Inye nwa ara bu otu n’ime ihe katagoro ahu ma di mma nke ukwu n’uwa niile gbaa gburu gburu, mana dika uwa na agbanwe, o na adimma inye umu nwanyi uche ma chetara ha ihe o ji di oke mkpa inye umu ha ara.
Inye nwa ara di oke mkpa n’ihi na:
Onweghi ihe ka mmiri ara mma nyere umu aka amuru ohuru
O na enyere akpa nwa aka ikwusi igba obara ma amucha nwa
O na egbochiri nwa oria di iche iche di ka Daibetes, Kansa, Diarrhea na Nimonia. Ihe mgbochi nne nwere na abanye n’ahu nwa site na mmiri ara
O na egbochiiri nne oria dika Kansa, okpukpu ike adighi ma ncha oyibo kporo Osteoporosis
Mmiri ara nwanyi, di ocha, di njikere oge obula, di otu nwa choro ya
O na enyere nne na nwa aka ime ihe oyibo kporo bonding
Nyere ufodu umu nwanyi, inye nwa ara na egbochi ha idi ime na nso na nso
A dighi agwuru ya ugwo
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.