Kedu ihe m ga eme iji hu na edebere nri m ofuma
From Audiopedia
QR for this page
Imirikiti oria mgbirima afo bu ndi na efe mmadu site na nri mmadu riri. Mgbe ufodu, nje na esi n’aka ndi na ako nri, ma o bu ndi na akwako nri ma o bu ndi na esi nri efegara ndi na eri ya. Mgbe ufodu, nje di n’ikuku na aba n’ime nri mebie ya. Nkea na emekari mgbe a na edebeghi nri ofuma, ma o bu mgbe a na esighi ya ofuma ma o bu mgbe nri ahu notegoro aka.