Ihe na -eme oge igba obara bu na akpa nwa na ejiko onu, iji kpofuo ihe ahu na aghoghi nwa. Njikonu a na ebute ezigbo ufu na okpuru afo na kwa na mgbada azu. Ihe a na akpo ihe a na oyibo bu Kramps. Ufu nwere ike ibido tutu obara agbawa ma o bu o bidochaa ohuru.
Kedu ihe i ga emenwu:
Bido hiwa okpuru afo gi aka. Nke a na enyere akwara gbasiri ike dajuo
Gbanye mmiri oku na kontena pulastiki, dewete ya na okpuru afo gi. Ma o bu tinye akwa na mmiri di oku, maa onwe gi ya na okpuru afo.
ipido aka na etiti mkpisi aka gi nke mbu na nke abuo nwere ike inyere aka wetuo otutu ufu.
Nwuo tii etinyere jinga, Kamomil ma o bu razberi. Umu nwanyi n’ime obodo gi nwerekwara ike i ma ihe ndi ozo inwere ike ime maka udi ufu a.
Gbaambo na aru oru ubochi gi
Gbalia mee ngaghari ahu ike ma o bu eksesaiz.
I nwere ike inu ogwu ufu. Nke a na akpo ibooprofin na agbanwe na oru a.
I na enwe nnukwu igba obara ma onweghi ihe ozo na akwusi ufu na eso ya, nwuo ogwu bet kontro ihe di ka afo isii ma o bu afo iri abuo na abuo. O nwere ike i nyere aka.
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.