Igba obara riri nne ma o buru na otu ihe a na etinye juru na otu awa
Igba obara tere aka ma o gbakaria mkpuru ubochi asato.
Mkpuru obara (ndi ahu gbara okpurukpu na adi ka liva) bu njirimara oke igba obara ma o bu heavy bleeding
Oke igba obara dirigawa otutu izu uka, onwa ma o bu aro ga enye mmadu obara ike adighi ana akpo anemiya (anemia)
Umu ihe ga ebuteli ihe a:
Ihe a na akpo homon imbalans nwere ike ihu na ovri emeputeghi Akwa. Nke a na emekari umunwanyi na agbabeghi afo iri abuo ma o bu ndi gafegoro afo iri ano.
Ihe a na akpo intra-uterine device eji eme nhazi ezi na ulo, family planin, na di eme ka igba obara butukwuo ibu.
Nwa ipu apu, ma i ma, ma i maghi na idi ime.
Oburu na inwee ufu na afo gi, ya na igba obara, inwere ike inwe afo ime di n’iro akpa nwa. O DI MKPA. Gaa uno ogwu ozigbo ozigbo.
I nwere ike inwe nsogbu na ebe a na akpo, thyroid gland
I nwere ike inwe otito faibrod ma o bu polips ma o bu Kansa akpa nwa.
O DI OKE MKPA: hu onye okachamalu ahu ike ma ihe ana ako maka mgbada ahu Pelvis ma i nwee oke igba obara nakwa:
Obara na agba ka mmiri si n’ahu nwanyi puta
Nso nwanyi ji obara di egwu bia, karigoro onwa ato
O digi ka idi ime
Ufu na eso igba obara di oke egwu
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.