Kedu ka ahum si agbanwe na pubati
Umu nwanyi niile na enwe mgbanwe na pubati mana ha na adi iche iche nyere onye obula. Nya bu, ya adina gi ka o nwere ihe di njo ma o buru na ahu gi adighi ka nke onye ozo.
Otito
Nke izizi i ga ahu nwere ike ibu na i na eto ngwa ngwa. I nwere ike ika umu nwoke niile gi na ha no otu afo ogologo. I ga akwusi ito n’ime otu afo ma o bu ato nso go bidoro.
Ahu Ngbanwe
Nwanne ito ogologo ngwa ngwa i ga ahu bu ahu gi ga ebodo ngbanwe. Enwegasiri kemikal di na ahu ana akpo Homone ga agwa ahu gi ha tokwuo ma mee ka ihe ndia puta ihe:
N’ime ahu gi
Onwere udi ngbanwe i naghi ejiri anya gi hu. Akpa nwa, tube, akwa, ahu nwanyi, ha niile ebido to we na agbanwe ebe ha nobu.
Ka ahu si eme gi
Ka ihe niile na aga, i ga ebido huwa onwe gi otu di iche. Inwere ike bido hutawa umu nwoke, nwebe enyi. O ga enwe oge o naghi ekwe gi ejikota onu, otu ahu si eme gi. Tutu nso gi abia n’onwa, o nwere ike idi ahu gi ka ihe ozo, o na adi gi akwa, o na adi gi amu, na agbokwojugi anya - udi ihe ahu.
Nso gi n’onwa n’onwa
Obara ahu na aputa bu ihe ngosi na iga atuta ime. Onweghi nwata nwanyi maranu oge nke izizi ya ga abia. O na eme ma o buru na ara ya puta, na kwa ntutu si ya ahu na aputacha. Otutu onwa tutu nke izizi a abia, o nwere ike ihu na ebe ahu di obere mmiri. O nweghi ihe na emebi ma ncha.
Ufodu umu nwanyi na enwe anuri oge ha huru nso ha nke izizi, okacha ma o buru na ha ma ihe na abia. Umu nwanyi a na agwaghi maka ya na di atu egwu ma obido. O bu ihe na eme nwanyi niile n’uwa gbaa gburu gburu. Ya enwela onye obula mere gi ka o dika ikwesiri izo iha ezo ma o bu nwee ihere maka ya.