Idi ocha n’ime obodo (nya bu mkpocha na nzacha), idi ocha n’ulo na kwa onwe mmadu idi ocha di oke mkpa igbochi oria ndi a site na ikwusi nje ifegharinu.
N’ima atu:
Otu nwoke bu nje afo osisa nyuru nsi na ilo
Otu Ezi aga rie nsi ahu
Otu n’ime umu nwoke a ga soro Ezi ahu gwurie egwu, metuchaa onwe ya nsi ahu
Emechaa, nwata kiri ahu bido bewe akwa. Nne ya guguo ya akwa ma were akwa oyi na ahu hichaa nwatakiri a aka ya. Nsi a bia tetatu nyanwa n’aka ya.
N’ihi na nwanyi a ji otutu ihe n’aka, O bia, siere ezinaulo ya nri na-ebughi uzo kwoo aka ya. O jirikwa akwa ya ahu butuo nri o na-esi n’oku rozoo na odighi ocha.
Ezi na ulo a erie nri ahu. O ma ete aka onye obula eburu afo osisa.
Nke bu eziokwu bu na, oburu na ezi na ulo a mere ihe ndia, ha gara igbochi nfesa nje ahu:
O buru na nwoke ahu gara na ebe mposi
O buru na aghaghi Ezi ahu ka o na agbaghari n’ilo
O buru na nwanyi ahu ejighi akwa oyi na ahu, nke o ji hichaa aka nsi ya, butu o nri o siri
O buru na nwanyi ahu kwochasiri aka ya ike tupu o siere ezi na ulo ya nri.
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.