Iso nne na nna kpa nkata adighi adi mfe. Ha nwere ike icho ka i biri otu ha choro ma i choghi ya otu ahu maka na odi gi na uwa ana eme ntughari. O nwere ike idi gi ka ha adighi ege gi nti ma o choo ighota ma o kwanu di gi ka ha aga ewesara gi iwe.
Ndi be unu nwere ike ihu gi na anya ma ha akwadoghi ihe niile i na eme. He nwere ike iwe iwe n’ihi na ha choro ka o diri gi na mma, obughi maka na ha choro ime gi ihe ojoo. Gbalie, kwanyere ha ugwu, ma jiru nwanyo kowaara ha ihe i choro ka ha ghota maka gi.
I nwere ike ihu ma ihe ndia aga aru oru:
Rolu oge di mma. Nabughi oge ha ji ihe na aka, ike kwuru ha, ma o bu oge ha na eche echiche banyere ihe ozo.
Gwa ha ihe niile na echu gi ura, juo ha ihe ha ga eme ma ha buru gi
Nye ha ihe guo, ma o bu gosi ha ihe banyere nsogbu i na enwe
Ihe kpasue gi iwe, ejela tiwe mkpu. I ga akpasu ha iwe. Ime nkea, ha ga echee na inaghi enye ha nsopuru
I nwalee ihe ndia, na enweghi ike igwa ha okwu, gbalia choro onye ozo i nwere ike igwa ihe na aga na ndu gi. O nwere ike iburu onye nkuzi, nwanne nne ma o bu nna gi, mama nnukwu gi, mmadu na ebe i na aga uka ma o bu onye okachamalu ahuike.
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.