Inweta nkwado: nsogbu mental helt na di adorocha ike umu nwanyi na akuda mmuo ya. Ihu umu nwanyi ndi ozo ga akwalite mmuo mmadu nke ga enyere ya aka igbo mkpa ndi o nwere.
Ichoputa ihe na eme: oge ufodu, umu nwanyi na di ezo ihe na eme ha ma o bu ghara ihu na onwere ihe na eme. Inu ndi ozo ebe ha na ako akuko ha na enyere aka iwepu ihere di na ihe na eme ya.
Inyere aka na ijikonata ‘impulse reaction’: ndi otu a nwere ike inyere nwanyi aka iche echiche banyere ihe bu nsogbu nke ga eme ka o ghara ime ihe izizi batara ya n’isi
Ichoputa ihe na ebute ihe: site na ikpa nkata, umu nwanyi na ebodi ihu na ha na enwe otu udi nsogbu nke na enyere aka ichoputa ihe na akpata ya
Ichota aziza: ichoputa otu a ga esi nweta osisa nsigbu obula na aka mma na etiti otu di otua karia otu nwanyi noro onwe ya.
Igwe bu ike: umu nwanyi na aruko onu kariri nke o bu naani ya ike.
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.