Kedu kam ga esi gbado anya nam nwere mmiri ara zuru oke nyanakwa na mmiri aram di mma
Enwere otutu umu nwanyi na eche na mmiri ara ha agaghi ezu. O nweghi eziokwu no na okwu a n’ihi na oburugodu na nne ahughi nri rie oge obula, o ka nwere ike imeputa mmiri ara ga ezu nwa ya.
Ihe na ekpebi mmiri ara one mmadu nwere bu otu nwa si anwu ara. O na anwu nnukwu, mmiri ara ana agba nnukwu. O buru na inyeghi ya nri ma o bu nyewe ya nri botul, ahu gi agahi emebe nnukwu mmiri ara.
I ga ahu na oge ufodu, o di gi ka so ihe nwa choro bu inu ara, inye ya oge obula o choro, mmiri ara gi ga na agba nke oma. Inye ya nri n’abali ma i na aahu ura na enyere aka imebe ogbigba mmiri ara. Gbalia hu na ikwetaghi onye obula - oburugodi onye na aru n’ulo ahu ike, gwara gi na inweghi mmiri ara ga ezuru nwa gi.
Ara ekwesighi idi gi ka ojuru eju tutu ikwete na mmiri ara di n’ime ya zuru ezu. Nwa na erikwahaa nri, ihe di n’udo. Ma ara eburu ibu, ma o pere mpe, o na emebe mmiri ma nwa na eri ya nke oma.
Nwatakiri na enweta mmiri ara zuru oke ma o buru na:
Otutu umu nwanyi na eche na mmiri ara adichaghi mma n’ihi na ya na fomula adighi ka o otu ihe mana onweghi ihe ka mmiri ara nyere umuaka amuru ohuru.