Kedu otu m ga esi debe nri ka o juo oyi
From Audiopedia
N’ime udu mmiri
Udi udu a, a ruru ya n’ime nnukwu udu ozo. Were mmiri kwanye n’ime oyere di na etiti udu nabo ahu. I ga ewere nnukwu ite, nwere okwuchi ana ahughi n’oku nke ga eme ka mmiri si na ite ahu nabaa n’ikuku. Udu nke obere kwesiri ka arusie ya ike ka mmiri ghara isi n’ime ya na aghafu.
N’ime Kobod
Were akpati, dokwasa n’elu okwute ka okwute ndi ahu bulie ya elu. Dokwasi kontena mmiri di na ya n’elu akpati ahu ma were akwa chikwasa n’elu kontena ahu. Kpuchie ha ncha. Mee ka akwa ahu ghara iru ala. Chinye akwa ahu n’ime mmiri ka mmiri o di gbasaruo akwa ahu niile. Tinye nri n’ime akpati. Ka mmiri di na akwa ahu na anachi n’ikuku, nri ahu ga na aju oyi. Uzo a ga aru ezi oru ma o buru na a ga edebenwu akwa ahu mmiri mgbe obula.