Kedu otu m ga esi enweta mmiri onunu di ocha
From Audiopedia - Accessible Learning for All
Ikwesiri ina edebe mmiri na drom ma o bu roba ma o bu ebe obula nwere okwuchi ma debekwa ebe ibi ocha.
Mmiri ana anwu anwu kwesiri ka edebe ya na ebe kachasi ocha. O buru na mmiri gbaruru agbaru, hapu ya ka o daa. I wee gbaru elu ya ebe di ocha. Tupu inwuo nke a, gbuo nje di n’ime ya. Ihe a na-akpo nke a bu purifikashun.
Debe mmiri ahu azaputara azaputa n’ime drom ma o bu roba di ocha nwere okwuchi. O buru na ejibugo kontena ahu debe ihe di ka mmanu, were ncha na mmiri oku sachapu ya mma tubu iwere ya debe mmiri. Anwakwala anwa busa mmiri na ihe ejiburu donye kemikal ma o bu fuwel. Gbaa mbo saa ebe mmiri na ado opekata mpe otu ugboro na izu.