Ana eme nleta ahu a, onye ahu ike ga aju ajuju gbasara ime na imu nwa gagoro aga. O ga aju ma e nwere nsogbu obula dika bliding (oke igba obara), o ga ajukwa ma o nwerela nwa nwubugoro anwu. Ihe ndia ga enyere unu abuo aka ikwado mara ihe aga eme n’afo ime nkea.
Onye na amu nwa nwere ike:
Ihu na nwanyi di ime na eri nri ofuma ma kwa gwa ya nri ka mma o kwesiri iri
Inye ayon ma o bu folik acid nke na enyere aka igbochi anemia na nwa inwe birth defekt.
Ileta nwanyi di ime iji hu na ahu di ya na nwa ya mma
Gbaa ogwu iji gbochi Tetanuus, oria nke nwere ike igbu ma nne na nwa.
Nye ogwu ga agwo iba
Leta ihu ma onye afo ime enwere HIV, sifilis, na oria ndi ozo a na esi na mmeko nwoke na nwanyi ebute.
Nye ogwu iji hu na nwayi bu HIV ebufeghi ya nwa ya.
Sources
Burns, A. A., Niemann, S., Lovich, R., Maxwell, J., & Shapiro, K. (2014). Where women have no doctor: A health guide for women. Hesperian Foundation.